O Chukwu nna di aso, Atọ-n'ime-otu dị Ngọzi,
Anyi na-ekele
Gị, n’ihi na ijiri nwodibọ gị bu Pope John
Paul II
were gozie nzuko Gị dị asọ site n’ime ka obi
ọma na
nchekwa nke Gị bu Nna, na ebube nke obe Jesu,
na ihe nke Muọ
Nsọ si na ya chakwasi Nzukọ Gị.
Site na nnukwu ntụkwasị obi o nwere n'ebere
gi di ọkpu na
arịrịọ nke Nne anyị dị asọ bụ Marịa, O
gosịrị anyị
Jesu bu ezigbo onye nche atụrụ dị ndu,
gosikwa anyị
na ịdị asọ bụ akara eji ama ezigbo ndu onye
otu Kristi
n’ụzọ na-egosiputakwa ịdị nma mmadu na
Chukwu.
Biko Nna, nye anyị amara nile anyị na-arịọ
gị site n'arịrịọ
ya, dika o si buru ebum n'uche gị. N'otu aka
ahu, anyị
nwekwara olile anya n’oge na adịghị anya
na-aga agunye
ya n'otu ndị Nsọ Gị.
Amen.