AYịYọ AMARA Dị ICHE-ICHE

SITE N’AKA NWODIBọ CHUKWU
POPE JOHN PAUL II

O Chukwu nna di aso, Atọ-n'ime-otu dị Ngọzi, Anyi na-ekele
Gị, n’ihi na ijiri nwodibọ gị bu Pope John Paul II
were gozie nzuko Gị dị asọ site n’ime ka obi ọma na
nchekwa nke Gị bu Nna, na ebube nke obe Jesu, na ihe nke Muọ
Nsọ si na ya chakwasi Nzukọ Gị.
Site na nnukwu ntụkwasị obi o nwere n'ebere gi di ọkpu na
arịrịọ nke Nne anyị dị asọ bụ Marịa, O gosịrị anyị
Jesu bu ezigbo onye nche atụrụ dị ndu, gosikwa anyị
na ịdị asọ bụ akara eji ama ezigbo ndu onye otu Kristi
n’ụzọ na-egosiputakwa ịdị nma mmadu na Chukwu.
Biko Nna, nye anyị amara nile anyị na-arịọ gị site n'arịrịọ
ya, dika o si buru ebum n'uche gị. N'otu aka ahu, anyị
nwekwara olile anya n’oge na adịghị anya na-aga agunye
ya n'otu ndị Nsọ Gị.
Amen.

 

 

 


 


With ecclesiastical approval
CARDINAL CAMILLO RUINI
the Holy Father’s Vicar General
for the Diocese of Rome

 
• Ayịyọ - igbo

© Libreria Editrice Vaticana

Preghiera